2 Kings 4

Mmanụ oliv nwanyị di ya nwụrụ

1Otu ụbọchị, otu nwanyị nʼime ndị inyom ndị amụma bịakwutere Ịlaisha rịọ ya sị, “Ohu gị, bụ di m anwụọla. Ị matara na ọ na-atụ egwu
Ọ sọpụụrụ Onyenwe anyị
Onyenwe anyị. Ma ugbu a, onye o ji ụgwọ na-abịa ịkpọrọ ụmụ m ndị ikom abụọ ime ka ha bụrụ ndị ohu ya.”

2Ịlaisha jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị ka m ga-emere gị? Gwa m, gịnị ka i nwere nʼụlọ?”

Nwanyị ahụ zara sị, “O nweghị ihe ọbụla ohu gị nwanyị nwere nʼụlọ karịa naanị ntakịrị mmanụ.”
Mmanụ bụ otu ngwa nri dị mkpa na nri niile ndị si na mpaghara ọwụwa anyanwụ na-eri. Mkpa ọ dị bụ na ọ na-edozi ahụ mmadụ.


3Ịlaisha sịrị, “Jegharịa na-ezi, gaa nata ndị agbataobi gị niile ite nke ihe ọbụla na-adịghị nʼime ya. Ha abụkwala ole na ole. 4Mgbe ahụ, baa nʼime ụlọ, gị na ụmụ gị, mechibido onwe unu ụzọ. Malite ịgbanye mmanụ ahụ nʼime ite ahụ niile, mgbe nke ọbụla juru, bupụ ya nʼotu akụkụ.”

5Nwanyị ahụ hapụrụ ya, ga mechibido onwe ya na ụmụ ya ndị ikom ụzọ. Ha na-ebutere ya ite niile ahụ nso, ebe ya onwe ya na-agbanye agbanye nʼime ha. 6Mgbe ọ gbajuru ite ndị ahụ niile, ọ sịrị nwa ya, “Butere m ite ọzọ.”

Ma ọ zara, “O nweghị ite ọzọ fọdụrụ.” Mgbe ahụ, mmanụ ahụ kwụsịrị ịgbapụta.

7Ọ gara gwa onye nke Chineke ahụ, onye sịrị, “Gaa, ree mmanụ ahụ, kwụkwaa ụgwọ unu ji. Gị na ụmụ gị ndị ikom were nke fọdụrụ mee mkpa dịrị unu.”

Nwanyị Shunem na nwa ya

8Otu ụbọchị, Ịlaisha gara nʼobodo Shunem. Otu nwanyị nwere ugwu bi nʼebe ahụ. Nwanyị ahụ rịọsiri ya ike ka o rie nri. Nʼihi ya, mgbe ọbụla Ịlaisha si nʼebe ahụ gafee, ọ na-akwụsị nʼebe ahụ rie ihe. 9Ma nwanyị ahụ gwara di ya okwu sị, “O doro m anya nke ọma na nwoke a na-akwụsị nʼụlọ anyị mgbe niile bụ onye nsọ nke Chineke. 10Biko, ka anyị doziere ya otu ọnụụlọ nta nʼime ụlọ elu anyị, ka anyị tinyere ya ihe ndina na tebul, na oche, na oriọna, ka o nwee ebe ọ ga na-anọ mgbe ọbụla ọ bịakwutere anyị.”

11Otu ụbọchị, mgbe Ịlaisha bịakwara nʼebe ahụ, ọ bara nʼọnụụlọ ahụ, dinaa nʼebe ahụ. 12Ọ sịrị Gehazi onye na-ejere ya ozi, “Gaa kpọọ onye Shunem a,” Ya mere, ọ kpọrọ ya, ọ bịara guzo nʼihu ya, 13Ịlaisha gwara Gehazi, “Gwa nwanyị ahụ, sị, ‘Lee, otu i si enye onwe gị nsogbu niile ndị a maka anyị. Ugbu a, gịnị ka a ga-emere gị? Ọ bụ ka anyị gwa eze okwu banyere gị, ka ọ bụ ịgwa onyeisi ndị agha?’ ”

Ọ zara, “Ebi m nʼetiti ndị m.”

14Ịlaisha jụrụ, “Gịnịkwa ka anyị ga-emere nwanyị a?”

Gehazi sịrị, “Nʼezie, o nweghị nwa nwoke, di ya emeekwala agadi.”

15Ịlaisha sịrị, “Kpọọ ya.” Ya mere, Gehazi kpọrọ ya, ọ bịara guzo nʼọnụ ụzọ. 16Ịlaisha sịrị, “Na mgbe dị otu a nʼafọ ọzọ, ị ga-eku nwa nwoke nʼaka gị abụọ.”

Ọ sịrị, “Mba, onyenwe m, biko, gị onye nke Chineke, agwala ohu gị nwanyị okwu ụgha.”

17Ma dịka Ịlaisha si kwuo, nwanyị ahụ tụụrụ ime, na mgbe ahụ nʼafọ ọzọ ya, ọ mụrụ nwa nwoke.

18Nwata ahụ toputara, otu ụbọchị ọ pụrụ jekwuru nna ya nʼubi, ebe ha nọ na-aghọ ọka. 19O tikuru nna ya sị ya, “Isi m o, isi m o!”

Nna ya sịrị otu nʼime ndị ohu ya, “Kuru ya kulaara nne ya.”
20O kuuru ya, kulaara ya nne ya, nwantakịrị nwoke ahụ nọdụrụ nʼapata nne ya ruo etiti ehihie, mgbe ọ nwụrụ. 21Nne ya kuuru ya rigoo nʼelu ụlọ ahụ, tọgbọ ya nʼelu ihe ndina ahụ onye nke Chineke ahụ na-edina, mechie ụzọ pụọ.

22O ziri ozi kpọọ di ya sị ya, “Biko, zitere m otu okorobịa na otu ịnyịnya ibu, ka m jekwuru onye Chineke ahụ. Aga m alọtakwa ọsịịsọ.”

23Ọ sịrị, “Gịnị mere i ji ejekwuru ya taa? Ọ bụghị Ọnwa ọhụrụ, ọ bụghịkwa ụbọchị izuike.”

Ọ zara sị, “Udo dị.”

24Mgbe ahụ, ọ nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya ibu ahụ, nye nwokorobịa ahụ iwu sị ya, “Gbasie ọsọ ike. Akwụsịkwala ịgba ọsọ ma ọ bụghị mgbe m gwara gị kwụsị.” 25Ya mere, o buliri ije,
Njem a, ga-abụ ihe dị ka kilomita iri atọ site nʼobodo Shunem ruo nʼugwu a.
gakwuru onye nke Chineke nʼugwu Kamel.

Mgbe o lepụrụ anya hụ ya ka ọ na-abịa, onye nke Chineke sịrị odibo ya bụ Gehazi, “Lee nwanyị Shunem ahụ.
26Gbara ọsọ gaa zute ya jụọ ya sị ya, ‘Ọ dịkwa mma? Dị gị ọ nọkwa nʼudo? Nwa gị ọ nọkwa nʼudo?’ ” Mgbe Gehazi zutere ya jụọ ajụjụ ndị a, nwanyị ahụ zara Gehazi sị ya,

“E, anyị niile nọ nʼudo, ihe niile na-aga nke ọma.”

27Ma mgbe ọ bịakwutere onye nke Chineke, ọ dara nʼala nʼihu ya, jide ya nʼụkwụ ya abụọ. Gehazi bịaruru nso inupu ya, ma onyeozi Chineke sịrị ya, “Hapụ ya aka, nʼihi na ọ dị ihe na-enye ya nsogbu nʼime mmụọ ya, ma Onyenwe anyị zonarịrị m ya, ọ gwaghịkwa m ihe mere.”

28Nwanyị ahụ sịrị, “Onyenwe m, arịọrọ m gị nye m nwa nwoke? Ọ bụ na m asịghị gị, ‘emeela m ka m nwee olileanya’?”

29Ịlaisha sịrị Gehazi, “Ngwa, were ihe ike nʼukwu jikọta uwe mwụda gị, werekwa mkpanaka m nʼaka gị, bilie gaa Shunem. Mgbe ị na-aga ekelekwala onye ọbụla ekele. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla ekelee gị, azala ekele ya. Gaa nʼụlọ ahụ. I ruo, tụkwasị mkpanaka m nʼihu nwantakịrị nwoke ahụ.”

30Ma nne nwantakịrị ahụ zara sị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị laa.” Ịlaisha biliri soro ya bido ịla nʼụlọ ya.

31Ma Gehazi butere ụzọ rute nʼụlọ ahụ, were mkpanaka ahụ tụkwasị nʼihu nwantakịrị nwoke ahụ, ma nke a emeghị ka nwantakịrị ahụ teta ma ọ bụkwanụ kuo ume. Ya mere, Gehazi laghachiri izute Ịlaisha, gwa ya sị, “Nwata ahụ etetaghị.”

32Mgbe Ịlaisha rutere nʼụlọ ahụ, ọ hụrụ ka nwantakịrị ahụ nwụrụ anwụ dina nʼelu ihe ndina ya. 33Ọ banyere nʼime ọnụụlọ ahụ, mechibido ha abụọ ụzọ, kpee ekpere, kpọkuo Onyenwe anyị. 34Emesịa, ọ makpuuru nʼelu nwantakịrị ahụ, tụkwasị ọnụ ya nʼọnụ nwantakịrị ahụ, na anya ya abụọ na nke nwantakịrị ahụ, na aka ya abụọ na nke ya. Mgbe o si otu a dinara nʼelu nwantakịrị ahụ, ahụ nwantakịrị ahụ malitere ikpo ọkụ ọzọ. 35Ịlaisha biliri jegharịa nʼime ụlọ ahụ ugboro ole na ole, laghachikwa makpuru nʼelu nwantakịrị ahụ ọzọ. Emesịa, nwantakịrị ahụ zere uzere ugboro asaa, meghe anya ya abụọ.

36Ịlaisha kpọrọ Gehazi sị ya, “Kpọọ nwanyị Shunem.” Ya mere, ọ kpọrọ ya. Mgbe ọ bịakwutere ya, ọ sịrị, “Kuru nwa gị.” 37Ọ batara, daa nʼala nʼụkwụ ya, kpọọ isiala. Emesịa, o kuuru nwa ya nwoke pụọ.

Ọnwụ dị nʼite nri

38Ịlaisha lọghachiri na Gilgal, mgbe ụnwụ dị nʼala ahụ. Otu ụbọchị, mgbe ya na ụfọdụ ndị amụma nọ na-enwe nzukọ, ọ gwara onye na-ejere ya ozi okwu sị ya: “Sikwasị ite ukwu ahụ nʼọkụ, siere ndị a mụ na ha nọ ihe oriri.”

39Otu onye nʼime ha pụrụ banye nʼọhịa ịchịkọta akwụkwọ nri. Ọ hụrụ osisi vaịnị toro nʼọhịa, chịkọtaa ụfọdụ afụfa ọhịa,
Mkpụrụ afụfa ọhịa yiri kukumba nʼọdịdị, buo ibu dịka oroma ma ọ na-elu ilu nʼọnụ.
nke o kpojuru nʼuwe mwụda ya dịka ọ ga-ejideli. Mgbe ọ lọghachiri, o gbupịasịrị afụfa ọhịa ndị a, wụnye ha nʼime ite ahụ si nʼọkụ, ọ bụ ezie na o nweghị onye maara ihe ha bụ.
40Mgbe o ghere, a wụpụtara ya nye ndị ikom ndị ahụ. Ma mgbe ha bidoro iri ya, ha tiri mkpu akwa sị, “Onye nke Chineke, lee, ọnwụ dị nʼite nri a.” Ha enwekwaghị ike iri ya.

41Ịlaisha kwuru okwu sị, “Kpotanụ ụtụ ọka.” Ọ ghanyere ya nʼime ite ahụ sị, “Kunyerenụ ha nri ka ha rie.” Ha riri ya. O nwekwaghị ihe na-egbu egbu dị nʼite ahụ.

Ịlaisha enye narị ndị amụma nri

42Otu nwoke si Baal-Shalisha bịa, butere onye nke Chineke ogbe achịcha iri abụọ nke e ji ọka balị mbụ a ghọtara nʼubi mee. O butekwaara ya isi ọka ole na ole nʼakpa. Ịlaisha sịrị, “Were ihe ndị a nye ndị anyị ka ha rie.”

43Onye na-ejere ya ozi jụrụ, “Olee otu m ga-esi chee ihe a nʼihu narị mmadụ?”

Ma Ịlaisha zara, “Chịrị ya nye ndị mmadụ a ka ha rie, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ha ga-eriju afọ ha, nwekwa ndị ga-afọdụkwa.’ ”
44Ya mere, o chere ya nʼihu ha, ha rikwara, nri ahụ fọdụkwara dịka okwu Onyenwe anyị si dị.

Copyright information for IboBIU